Native Bible

Proverbs 1:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?

Proverbs 1:22 in English

Proverbs 1:22 · Berean Standard Bible

“How long, O simple ones, will you love your simple ways? How long will scoffers delight in their scorn and fools hate knowledge?

Context

20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama. 21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile. 22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị? 23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m. 24Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.