Ilu 1:24
Proverbs 1:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
Proverbs 1:24 in English
Proverbs 1:24 · Berean Standard Bible
Because you refused my call, and no one took my outstretched hand,
Context
22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo?
Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị? 23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,
aga m emekwa ka unu mara okwu m. 24Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku,
setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị, 25ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị,
jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu, 26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.
Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.