Ọbadaya 1:17
Obadiah 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
Obadiah 1:17 in English
Obadiah 1:17 · Berean Standard Bible
But on Mount Zion there will be deliverance, and it will be holy, and the house of Jacob will reclaim their possession.
Context
15“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso
nye mba niile.
Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị;
ihe i metara ga-adị gị nʼisi. 16Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ
otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị.
Ha ga-aṅụ, ṅụọ,
ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ. 17Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ,
ọ ga-adị nsọ,
ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ. 18Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ,
ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ:
ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka.
Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya.
Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ
site nʼụlọ Ịsọ.”
Onyenwe anyị ekwuola ya. 19Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi
nʼugwu ugwu Ịsọ,
ndị si na Shefela*
ga-enwekọta ala ndị Filistia.
Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria.
Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.