Native Bible

Obadiah 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.

Obadiah 1:16 in English

Obadiah 1:16 · Berean Standard Bible

For as you drank on My holy mountain, so all the nations will drink continually. They will drink and gulp it down; they will be as if they had never existed.

Context

14I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha. 15“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi. 16Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ. 17Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ. 18Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.