Ọbadaya 1:19
Obadiah 1:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela* ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
Obadiah 1:19 in English
Obadiah 1:19 · Berean Standard Bible
Those from the Negev will possess the mountains of Esau; those from the foothills * will possess the land of the Philistines. They will occupy the fields of Ephraim and Samaria, and Benjamin will possess Gilead.
Context
17Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ,
ọ ga-adị nsọ,
ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ. 18Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ,
ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ:
ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka.
Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya.
Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ
site nʼụlọ Ịsọ.”
Onyenwe anyị ekwuola ya. 19Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi
nʼugwu ugwu Ịsọ,
ndị si na Shefela*
ga-enwekọta ala ndị Filistia.
Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria.
Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead. 20Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala,
ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat.
Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad,
ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb. 21Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn
maka ịchị ugwu Ịsọ niile.
Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.
1:19 Ndị a bi nʼebe ala ala ugwu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.