Ọnụọgụgụ 3:16
Numbers 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
Numbers 3:16 in English
Numbers 3:16 · Berean Standard Bible
So Moses numbered them according to the word of the LORD, as he had been commanded.
Context
14Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya, 15“Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ.* Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.” 16Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị. 17Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị:
Geshọn, Kohat na Merari. 18Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị:
Libni na Shimei.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.