Ọnụọgụgụ 3:15
Numbers 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ.* Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.”
Numbers 3:15 in English
Numbers 3:15 · Berean Standard Bible
“Number the Levites by their families and clans. You are to count every male a month old or more.”
Context
13Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.” 14Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya, 15“Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ.* Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.” 16Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị. 17Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị:
Geshọn, Kohat na Merari.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.