Ọnụọgụgụ 26:57
Numbers 26:57 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari.
Numbers 26:57 in English
Numbers 26:57 · Berean Standard Bible
Now these were the Levites numbered by their clans: The Gershonite clan from Gershon, the Kohathite clan from Kohath, and the Merarite clan from Merari.
Context
55Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị. 56A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.” 57Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị,
ikwu Geshọn, site na Geshọn,
ikwu Kohat, site na Kohat,
ikwu Merari, site na Merari. 58Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị:
ikwu Libni,
ikwu Hebrọn,
ikwu Mahali,
ikwu Mushi, na
ikwu Kora.
(Kohat bụ nna nna Amram. 59Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.