Native Bible

Numbers 26:56 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”

Numbers 26:56 in English

Numbers 26:56 · Berean Standard Bible

Each inheritance is to be divided by lot among the larger and smaller tribes.”

Context

54Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere. 55Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị. 56A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.” 57Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari. 58Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.