Ọnụọgụgụ 26:59
Numbers 26:59 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
Numbers 26:59 in English
Numbers 26:59 · Berean Standard Bible
and Amram’s wife was named Jochebed. She was also a daughter of Levi, born to Levi in Egypt. To Amram she bore Aaron, Moses, and their sister Miriam.
Context
57Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị,
ikwu Geshọn, site na Geshọn,
ikwu Kohat, site na Kohat,
ikwu Merari, site na Merari. 58Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị:
ikwu Libni,
ikwu Hebrọn,
ikwu Mahali,
ikwu Mushi, na
ikwu Kora.
(Kohat bụ nna nna Amram. 59Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị. 60Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama. 61Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.