Ọnụọgụgụ 24:8
Numbers 24:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
Numbers 24:8 in English
Numbers 24:8 · Berean Standard Bible
God brought him out of Egypt with strength like a wild ox, to devour hostile nations and crush their bones, to pierce them with arrows.
Context
6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,
a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.
Ha nwere ike dịka atụ.
Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.
Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,
jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha. 9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,
dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?
“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,
ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.” 10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.