Ọnụọgụgụ 24:9
Numbers 24:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
Numbers 24:9 in English
Numbers 24:9 · Berean Standard Bible
He crouches, he lies down like a lion; like a lioness, who dares to rouse him? Blessed are those who bless you and cursed are those who curse you.”
Context
7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,
a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.
Ha nwere ike dịka atụ.
Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.
Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,
jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha. 9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,
dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?
“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,
ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.” 10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.