Ọnụọgụgụ 24:11
Numbers 24:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
Numbers 24:11 in English
Numbers 24:11 · Berean Standard Bible
Therefore, flee at once to your home! I said I would richly reward you, but instead the LORD has denied your reward.”
Context
9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,
dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?
“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,
ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.” 10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.” 12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m, 13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.