Ọnụọgụgụ 24:12
Numbers 24:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
Numbers 24:12 in English
Numbers 24:12 · Berean Standard Bible
Balaam answered Balak, “Did I not already tell the messengers you sent me
Context
10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a. 11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.” 12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m, 13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’? 14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.