Ọnụọgụgụ 24:6
Numbers 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
Numbers 24:6 in English
Numbers 24:6 · Berean Standard Bible
They spread out like palm groves,* like gardens beside a stream, like aloes the LORD has planted, like cedars beside the waters.
Context
4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke
onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe. 5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,
ebe obibi gị niile, gị Izrel! 6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,
a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.
Ha nwere ike dịka atụ.
Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.
Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,
jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.