Ọnụọgụgụ 24:5
Numbers 24:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
Numbers 24:5 in English
Numbers 24:5 · Berean Standard Bible
How lovely are your tents, O Jacob, your dwellings, O Israel!
Context
3O buru amụma ndị a sị,
“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,
okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe. 4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke
onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe. 5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,
ebe obibi gị niile, gị Izrel! 6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,
a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.