Ọnụọgụgụ 24:4
Numbers 24:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
Numbers 24:4 in English
Numbers 24:4 · Berean Standard Bible
the prophecy of one who hears the words of God, who sees a vision from the Almighty,* who bows down with eyes wide open:
Context
2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya. 3O buru amụma ndị a sị,
“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,
okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe. 4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke
onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe. 5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,
ebe obibi gị niile, gị Izrel! 6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.