Native Bible

Numbers 24:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”

Numbers 24:20 in English

Numbers 24:20 · Berean Standard Bible

Then Balaam saw Amalek and lifted up an oracle, saying: “Amalek was first among the nations, but his end is destruction.”

Context

18A ga-emeri Edọm,* Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike. 19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.” 20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!” 21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,* akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ! 22Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.