Ọnụọgụgụ 24:19
Numbers 24:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
Numbers 24:19 in English
Numbers 24:19 · Berean Standard Bible
A ruler will come from Jacob and destroy the survivors of the city.”
Context
17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,
ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.
Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.
Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.
Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. 18A ga-emeri Edọm,*
Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.
Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike. 19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.
Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.” 20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:
“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,
ma ikpeazụ ya bụ mbibi!” 21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:
“E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,*
akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.