Ọnụọgụgụ 24:18
Numbers 24:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-emeri Edọm,* Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
Numbers 24:18 in English
Numbers 24:18 · Berean Standard Bible
Edom will become a possession, as will Seir, his enemy; but Israel will perform with valor.
Context
16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,
onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.
Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe. 17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,
ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.
Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.
Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.
Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. 18A ga-emeri Edọm,*
Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.
Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike. 19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.
Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.” 20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:
“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,
ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.