Ọnụọgụgụ 24:16
Numbers 24:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
Numbers 24:16 in English
Numbers 24:16 · Berean Standard Bible
the prophecy of one who hears the words of God, who has knowledge from the Most High, who sees a vision from the Almighty, who bows down with eyes wide open:
Context
14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.” 15Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:
“Amụma Belam nwa Beoa,
amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma, 16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,
onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.
Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe. 17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,
ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.
Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.
Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.
Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,
na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. 18A ga-emeri Edọm,*
Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.
Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.