Native Bible

Numbers 24:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,

Numbers 24:15 in English

Numbers 24:15 · Berean Standard Bible

Then Balaam lifted up an oracle, saying, “This is the prophecy of Balaam son of Beor, the prophecy of a man whose eyes are open,

Context

13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’? 14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.” 15Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma, 16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe. 17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.