Native Bible

Numbers 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.

Numbers 1:17 in English

Numbers 1:17 · Berean Standard Bible

So Moses and Aaron took these men who had been designated by name,

Context

15site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.” 16Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel. 17Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha. 18Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu, 19dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.