Ọnụọgụgụ 1:18
Numbers 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,
Numbers 1:18 in English
Numbers 1:18 · Berean Standard Bible
and on the first day of the second month they assembled the whole congregation and recorded their ancestry by clans and families, counting one by one the names of those twenty years of age or older,
Context
16Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel. 17Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha. 18Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu, 19dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị. 20Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.