Maika 4:9
Micah 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike? Ọ bụ na i nweghị eze? Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme?
Micah 4:9 in English
Micah 4:9 · Berean Standard Bible
Why do you now cry aloud? Is there no king among you? Has your counselor perished so that anguish grips you like a woman in labor?
Context
7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ,
meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike.
Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ,
ugwu nke nwaada Zayọn,
ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị;
bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.” 9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike?
Ọ bụ na i nweghị eze?
Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla
nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme? 10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn,
dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme,
nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a
jee biri nʼọhịa.
Unu aghaghị ịga Babilọn,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu.
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu
site nʼaka ndị iro unu. 11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla
imegide gị;
na-asị, “Ka e merụọ ya
ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.