Maika 4:8
Micah 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ, ugwu nke nwaada Zayọn, ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị; bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”
Micah 4:8 in English
Micah 4:8 · Berean Standard Bible
And you, O watchtower of the flock, O stronghold * of the Daughter of Zion— the former dominion will be restored to you; sovereignty will come to the Daughter of Jerusalem.”
Context
6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“aga m achịkọta ndị ngwụrọ,
chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ,
na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ. 7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ,
meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike.
Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ,
ugwu nke nwaada Zayọn,
ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị;
bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.” 9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike?
Ọ bụ na i nweghị eze?
Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla
nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme? 10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn,
dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme,
nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a
jee biri nʼọhịa.
Unu aghaghị ịga Babilọn,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu.
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu
site nʼaka ndị iro unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.