Maika 4:6
Micah 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “aga m achịkọta ndị ngwụrọ, chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ, na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ.
Micah 4:6 in English
Micah 4:6 · Berean Standard Bible
“On that day,” declares the LORD, “I will gather the lame; I will assemble the outcast, even those whom I have afflicted.
Context
4Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị
na nʼokpuru osisi fiig ya,
nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya. 5Mba dị iche iche ga-agagharị
nke ọbụla nʼaha chi ya,
ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị,
bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. 6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“aga m achịkọta ndị ngwụrọ,
chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ,
na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ. 7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ,
meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike.
Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. 8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ,
ugwu nke nwaada Zayọn,
ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị;
bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.