Maika 4:5
Micah 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba dị iche iche ga-agagharị nke ọbụla nʼaha chi ya, ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Micah 4:5 in English
Micah 4:5 · Berean Standard Bible
Though each of the peoples may walk in the name of his god, yet we will walk in the name of the LORD our God forever and ever.
Context
3Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge,
kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 4Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị
na nʼokpuru osisi fiig ya,
nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya. 5Mba dị iche iche ga-agagharị
nke ọbụla nʼaha chi ya,
ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị,
bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. 6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“aga m achịkọta ndị ngwụrọ,
chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ,
na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ. 7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ,
meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike.
Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha
site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.