Maika 4:3
Micah 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche, doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge, kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
Micah 4:3 in English
Micah 4:3 · Berean Standard Bible
Then He will judge between many peoples and arbitrate for strong nations far and wide. Then they will beat their swords into plowshares and their spears into pruning hooks. Nation will no longer take up the sword against nation, nor will they train anymore for war.
Context
1Nʼụbọchị ikpeazụ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
ndị dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 2Ọtụtụ mba ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ* ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta. 3Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge,
kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 4Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị
na nʼokpuru osisi fiig ya,
nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya. 5Mba dị iche iche ga-agagharị
nke ọbụla nʼaha chi ya,
ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị,
bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.