Native Bible

Micah 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Susie ude ike, gị nwaada Zayọn, dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme, nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a jee biri nʼọhịa. Unu aghaghị ịga Babilọn, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu. Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu site nʼaka ndị iro unu.

Micah 4:10 in English

Micah 4:10 · Berean Standard Bible

Writhe in agony, O Daughter of Zion, like a woman in labor. For now you will leave the city and camp in the open fields. You will go to Babylon; there you will be rescued; there the LORD will redeem you from the hand of your enemies!

Context

8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ, ugwu nke nwaada Zayọn, ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị; bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.” 9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike? Ọ bụ na i nweghị eze? Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme? 10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn, dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme, nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a jee biri nʼọhịa. Unu aghaghị ịga Babilọn, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu. Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu site nʼaka ndị iro unu. 11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla imegide gị; na-asị, “Ka e merụọ ya ka anya anyị ṅụọ Zayọn.” 12Ma ha amaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị, ha aghọtakwaghị nzube ya, na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.