Maika 4:10
Micah 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Susie ude ike, gị nwaada Zayọn, dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme, nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a jee biri nʼọhịa. Unu aghaghị ịga Babilọn, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu. Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu site nʼaka ndị iro unu.
Micah 4:10 in English
Micah 4:10 · Berean Standard Bible
Writhe in agony, O Daughter of Zion, like a woman in labor. For now you will leave the city and camp in the open fields. You will go to Babylon; there you will be rescued; there the LORD will redeem you from the hand of your enemies!
Context
8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ,
ugwu nke nwaada Zayọn,
ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị;
bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.” 9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike?
Ọ bụ na i nweghị eze?
Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla
nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme? 10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn,
dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme,
nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a
jee biri nʼọhịa.
Unu aghaghị ịga Babilọn,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu.
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu
site nʼaka ndị iro unu. 11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla
imegide gị;
na-asị, “Ka e merụọ ya
ka anya anyị ṅụọ Zayọn.” 12Ma ha amaghị
ihe bụ uche Onyenwe anyị,
ha aghọtakwaghị nzube ya,
na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.