Maika 4:11
Micah 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla imegide gị; na-asị, “Ka e merụọ ya ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”
Micah 4:11 in English
Micah 4:11 · Berean Standard Bible
But now many nations have assembled against you, saying, “Let her be defiled, and let us feast our eyes on Zion.”
Context
9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike?
Ọ bụ na i nweghị eze?
Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla
nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme? 10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn,
dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme,
nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a
jee biri nʼọhịa.
Unu aghaghị ịga Babilọn,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu.
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu
site nʼaka ndị iro unu. 11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla
imegide gị;
na-asị, “Ka e merụọ ya
ka anya anyị ṅụọ Zayọn.” 12Ma ha amaghị
ihe bụ uche Onyenwe anyị,
ha aghọtakwaghị nzube ya,
na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka. 13“Bilie, zọchaa, gị nwaada Zayọn,
nʼihi na aga m enye gị mpi igwe.
Aga m enyekwa gị ụkwụ ọla bronz,
ị ga-etijisikwa ọtụtụ mba.
Uru ha niile, nke ha nwetara nʼụzọ na-ezighị ezi, ka ị ga-enye Onyenwe anyị.
Akụnụba ha ka ị ga-enyekwa Chineke nwe ụwa niile.”
4:2 Maọbụ, ụkpụrụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.