Maika 3:9
Micah 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
Micah 3:9 in English
Micah 3:9 · Berean Standard Bible
Now hear this, O leaders of the house of Jacob and rulers of the house of Israel, who despise justice and pervert all that is right,
Context
7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,
ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.
Ha ga-ekpuchi ihu ha,
nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.” 8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,
ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,
jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,
na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,
na nye Izrel mmehie ya. 9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,
na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,
ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi. 10Ndị ji ọbara wuo Zayọn,
werekwa ajọ omume wuo Jerusalem. 11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị,
ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ,
ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego.
Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị,
“Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị?
O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.