Maika 3:8
Micah 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike, ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị, jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi, na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya, na nye Izrel mmehie ya.
Micah 3:8 in English
Micah 3:8 · Berean Standard Bible
As for me, however, I am filled with power by the Spirit of the LORD, with justice and courage, to declare to Jacob his transgression and to Israel his sin.
Context
6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;
ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.
Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,
ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha. 7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,
ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.
Ha ga-ekpuchi ihu ha,
nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.” 8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,
ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,
jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,
na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,
na nye Izrel mmehie ya. 9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,
na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,
ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi. 10Ndị ji ọbara wuo Zayọn,
werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.