Maika 3:7
Micah 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme, ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ. Ha ga-ekpuchi ihu ha, nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
Micah 3:7 in English
Micah 3:7 · Berean Standard Bible
Then the seers will be ashamed and the diviners will be disgraced. They will all cover their mouths because there is no answer from God.”
Context
5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Banyere ndị amụma
bụ ndị na-eduhie ndị m,
mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,
ha na-ekwusa ‘Udo’
ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,
ha na-ebili buo agha* megide onye dị otu a. 6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;
ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.
Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,
ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha. 7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,
ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.
Ha ga-ekpuchi ihu ha,
nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.” 8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,
ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,
jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,
na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,
na nye Izrel mmehie ya. 9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,
na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,
ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.