Maika 3:5
Micah 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “Banyere ndị amụma bụ ndị na-eduhie ndị m, mgbe ha nwere ihe ha ga-eri, ha na-ekwusa ‘Udo’ ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri, ha na-ebili buo agha* megide onye dị otu a.
Micah 3:5 in English
Micah 3:5 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “As for the prophets who lead My people astray, who proclaim peace while they chew with their teeth, but declare war against one who puts nothing in their mouths:
Context
3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,
na-agba ha akpụkpọ,
na-etijisi ọkpụkpụ ha,
na-egburi anụ ahụ ha,
dịka anụ a na-esinye nʼite.” 4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,
ma ọ gaghị aza ha!
Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ
nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere. 5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Banyere ndị amụma
bụ ndị na-eduhie ndị m,
mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,
ha na-ekwusa ‘Udo’
ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,
ha na-ebili buo agha* megide onye dị otu a. 6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;
ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.
Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,
ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha. 7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,
ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.
Ha ga-ekpuchi ihu ha,
nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.