Maika 3:4
Micah 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
Micah 3:4 in English
Micah 3:4 · Berean Standard Bible
Then they will cry out to the LORD, but He will not answer them. At that time He will hide His face from them because of the evil they have done.
Context
2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.
Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ
na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha. 3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,
na-agba ha akpụkpọ,
na-etijisi ọkpụkpụ ha,
na-egburi anụ ahụ ha,
dịka anụ a na-esinye nʼite.” 4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,
ma ọ gaghị aza ha!
Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ
nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere. 5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Banyere ndị amụma
bụ ndị na-eduhie ndị m,
mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,
ha na-ekwusa ‘Udo’
ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,
ha na-ebili buo agha* megide onye dị otu a. 6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;
ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.
Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,
ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.