Maika 3:2
Micah 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
Micah 3:2 in English
Micah 3:2 · Berean Standard Bible
You hate good and love evil. You tear the skin from my people and strip the flesh from their bones.
Context
1Mgbe ahụ ekwuru m sị,
“Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb,
na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel.
Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi 2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.
Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ
na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha. 3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,
na-agba ha akpụkpọ,
na-etijisi ọkpụkpụ ha,
na-egburi anụ ahụ ha,
dịka anụ a na-esinye nʼite.” 4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,
ma ọ gaghị aza ha!
Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ
nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.