Maika 3:1
Micah 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi
Micah 3:1 in English
Micah 3:1 · Berean Standard Bible
Then I said: “Hear now, O leaders of Jacob, you rulers of the house of Israel. Should you not know justice?
Context
1Mgbe ahụ ekwuru m sị,
“Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb,
na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel.
Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi 2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.
Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ
na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha. 3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,
na-agba ha akpụkpọ,
na-etijisi ọkpụkpụ ha,
na-egburi anụ ahụ ha,
dịka anụ a na-esinye nʼite.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.