Maika 3:10
Micah 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ji ọbara wuo Zayọn, werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
Micah 3:10 in English
Micah 3:10 · Berean Standard Bible
who build Zion with bloodshed and Jerusalem with iniquity.
Context
8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,
ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,
jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,
na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,
na nye Izrel mmehie ya. 9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,
na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.
Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,
ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi. 10Ndị ji ọbara wuo Zayọn,
werekwa ajọ omume wuo Jerusalem. 11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị,
ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ,
ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego.
Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị,
“Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị?
O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.” 12Ọ bụ nʼihi gị
ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi,
Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.
3:5 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ha na-ede agha nsọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.