Matiu 26:46
Matthew 26:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”
Matthew 26:46 in English
Matthew 26:46 · Berean Standard Bible
Rise, let us go! See, My betrayer is approaching!”
Context
44Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 45Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 46Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!” 47Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi.* Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 48Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.