Matiu 26:47
Matthew 26:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi.* Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
Matthew 26:47 in English
Matthew 26:47 · Berean Standard Bible
While Jesus was still speaking, Judas, one of the Twelve, arrived, accompanied by a large crowd armed with swords and clubs, sent from the chief priests and elders of the people.
Context
45Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 46Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!” 47Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi.* Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 48Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” 49Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.