Native Bible

Matthew 26:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!”

Matthew 26:48 in English

Matthew 26:48 · Berean Standard Bible

Now the betrayer had arranged a signal with them: “The One I kiss is the man; arrest Him.”

Context

46Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!” 47Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi.* Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 48Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” 49Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 50Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.