Matiu 26:50
Matthew 26:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike.
Matthew 26:50 in English
Matthew 26:50 · Berean Standard Bible
“Friend,” Jesus replied, “do what you came for.”* Then the men stepped forward, seized Jesus, and arrested Him.
Context
48Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” 49Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 50Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.”
Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike. 51Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 52Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.