Native Bible

Matthew 26:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.

Matthew 26:51 in English

Matthew 26:51 · Berean Standard Bible

At this, one of Jesus’ companions drew his sword and struck the servant of the high priest, cutting off his ear.

Context

49Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 50Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike. 51Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 52Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma. 53I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.