Native Bible

Matthew 26:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.

Matthew 26:44 in English

Matthew 26:44 · Berean Standard Bible

So He left them and went away once more and prayed a third time, saying the same thing.

Context

42Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” 43Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. 44Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 45Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie. 46Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.