Matiu 26:42
Matthew 26:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.”
Matthew 26:42 in English
Matthew 26:42 · Berean Standard Bible
A second time He went away and prayed, “My Father, if this cup cannot pass unless I drink it, may Your will be done.”
Context
40Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? 41Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa.* Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” 42Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” 43Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. 44Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.