Native Bible

Matthew 26:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa.* Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”

Matthew 26:41 in English

Matthew 26:41 · Berean Standard Bible

“Watch and pray so that you will not enter into temptation. For the spirit is willing, but the body is weak.”

Context

39Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” 40Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? 41Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa.* Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” 42Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” 43Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.