Matiu 26:43
Matthew 26:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.
Matthew 26:43 in English
Matthew 26:43 · Berean Standard Bible
And again Jesus returned and found them sleeping—for their eyes were heavy.
Context
41Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa.* Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” 42Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” 43Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. 44Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. 45Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.