Levitikọs 24:15
Leviticus 24:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya.
Leviticus 24:15 in English
Leviticus 24:15 · Berean Standard Bible
And you are to tell the Israelites, ‘If anyone curses his God, he shall bear the consequences of his sin.
Context
13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 14“Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya. 15Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya. 16Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu. 17“ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.