Native Bible

Leviticus 24:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.

Leviticus 24:14 in English

Leviticus 24:14 · Berean Standard Bible

“Take the blasphemer * outside the camp, and have all who heard him lay their hands on his head; then have the whole assembly stone him.

Context

12Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu Onyenwe anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya. 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 14“Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya. 15Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya. 16Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.